2 Samuel 24:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
2 Samuel 24:17 in English
2 Samuel 24:17 · Berean Standard Bible
When David saw the angel striking down the people, he said to the LORD, “Surely I, the shepherd,* have sinned and acted wickedly. But these sheep, what have they done? Please, let Your hand fall upon me and my father’s house.”
Context
15Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba. 16Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere Onyenwe anyị nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus. 17Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” 18Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.” 19Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.