2 Samuel 22:41
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
2 Samuel 22:41 in English
2 Samuel 22:41 · Berean Standard Bible
You have made my enemies retreat before me; I put an end to those who hated me.
Context
39Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ. 40Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 41I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
Ebibiekwala m ha niile. 42Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha. 43Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.