Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.

2 Samuel 17:24 in English

2 Samuel 17:24 · Berean Standard Bible

Then David went to Mahanaim, and Absalom crossed the Jordan with all the men of Israel.

Context

22Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan. 23Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya. 24Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya. 25Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel,* onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. 26Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.