2 Samuel 17:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.
2 Samuel 17:26 in English
2 Samuel 17:26 · Berean Standard Bible
So the Israelites and Absalom camped in the land of Gilead.
Context
24Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya. 25Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel,* onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. 26Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead. 27Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia* nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim 28wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.