2 Samuel 17:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia* nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim
2 Samuel 17:27 in English
2 Samuel 17:27 · Berean Standard Bible
When David came to Mahanaim, he was met by Shobi son of Nahash from Rabbah of the Ammonites, Machir son of Ammiel from Lo-debar, and Barzillai the Gileadite from Rogelim.
Context
25Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel,* onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. 26Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead. 27Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia* nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim 28wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. 29O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”
17:4 Ha nabatara atụmatụ ahụ
17:19 Jos 2:4-6
17:25 Lee anya na 1Ih 2:17. Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie nke ndị Hibru nakwa ndị ọzọ na-asị Onye Izrel
17:27 Makia bụ nwoke ahụ nabatara Mefiboshet nʼụlọ ya. 2Sa 9:4
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.