2 Samuel 17:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ
2 Samuel 17:18 in English
2 Samuel 17:18 · Berean Standard Bible
But a young man did see them and told Absalom. So the two left quickly and came to the house of a man in Bahurim. He had a well in his courtyard, and they climbed down into it.
Context
16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ” 17Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. 18Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ 19Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya.* Ọ dịghị onye maara maka ya. 20Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”?
Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.