2 Samuel 17:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”
2 Samuel 17:16 in English
2 Samuel 17:16 · Berean Standard Bible
Now send quickly and tell David, ‘Do not spend the night at the fords of the wilderness, but be sure to cross over. Otherwise the king and all the people with him will be swallowed up.’”
Context
14Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ. 15Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ. 16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ” 17Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. 18Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.