Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”

2 Samuel 15:36 in English

2 Samuel 15:36 · Berean Standard Bible

Indeed, their two sons, Ahimaaz son of Zadok and Jonathan son of Abiathar, are there with them. Send them to me with everything you hear.”

Context

34Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. 35Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. 36Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.” 37Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ. 15:12 Ahitofel bụ nna nna Batsheba, nke a dị nʼakwụkwọ 2Sa 11:3; 23:34 15:30 Nke a na-egosipụta ọnọdụ obi ọjọọ na iru ụjụ. Gụọ 2Sa 19:4; Est 6:12; Izk 24:17,23; Aịz 20:2-4 15:32 Ndị Juu na ndị Akai nwere ka ha si bụrụ nwanne, e dere nke a nʼakwụkwọ. Jos 16:2

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.