Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel.

2 Samuel 15:34 in English

2 Samuel 15:34 · Berean Standard Bible

But you can thwart the counsel of Ahithophel for me if you return to the city and say to Absalom: ‘I will be your servant, my king; in the past I was your father’s servant, but now I will be your servant.’

Context

32Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai* nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. 33Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. 34Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. 35Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. 36Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.