2 Samuel 11:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.”
2 Samuel 11:24 in English
2 Samuel 11:24 · Berean Standard Bible
Then the archers shot at your servants from the wall, and some of the king’s servants were killed. And your servant Uriah the Hittite is dead as well.”
Context
22Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie. 23Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. 24Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.” 25Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.” 26Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.