Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ.

2 Samuel 11:23 in English

2 Samuel 11:23 · Berean Standard Bible

The messenger said to David, “The men overpowered us and came out against us in the field, but we drove them back to the entrance of the gate.

Context

21Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ” 22Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie. 23Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. 24Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.” 25Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.