2 Samuel 11:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.
2 Samuel 11:26 in English
2 Samuel 11:26 · Berean Standard Bible
When Uriah’s wife heard that her husband was dead, she mourned for him.
Context
24Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.” 25Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.” 26Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya. 27Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.