2 Samuel 10:1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn* nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 Samuel 10:1 in English
2 Samuel 10:1 · Berean Standard Bible
Some time later, the king of the Ammonites died and was succeeded by his son Hanun.
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn* nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya.
Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.