Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”

2 Samuel 10:3 in English

2 Samuel 10:3 · Berean Standard Bible

the princes of the Ammonites said to Hanun their lord, “Just because David has sent you comforters, do you really believe he is showing respect for your father? Has not David instead sent his servants to explore the city, spy it out, and overthrow it?”

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn* nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?” 4Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha. 5Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.