Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn,

2 Samuel 10:2 in English

2 Samuel 10:2 · Berean Standard Bible

And David said, “I will show kindness to Hanun son of Nahash, just as his father showed kindness to me.” So David sent some of his servants to console Hanun concerning his father. But when they arrived in the land of the Ammonites,

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn* nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?” 4Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.