Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”

2 Samuel 1:3 in English

2 Samuel 1:3 · Berean Standard Bible

“Where have you come from?” David asked. “I have escaped from the Israelite camp,” he replied.

Context

1Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. 2O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ. 3Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.” 4Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!” 5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.