Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”

2 Samuel 1:5 in English

2 Samuel 1:5 · Berean Standard Bible

Then David asked the young man who had brought him the report, “How do you know that Saul and his son Jonathan are dead?”

Context

3Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.” 4Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!” 5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?” 6Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. 7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.