2 Ndị Eze 9:4
2 Kings 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
2 Kings 9:4 in English
2 Kings 9:4 · Berean Standard Bible
So the young prophet went to Ramoth-gilead,
Context
2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. 3Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.” 4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. 5Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.”
Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?”
Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.” 6Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.