2 Ndị Eze 9:3
2 Kings 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
2 Kings 9:3 in English
2 Kings 9:3 · Berean Standard Bible
Then take the flask of oil, pour it on his head, and declare, ‘This is what the LORD says: I anoint you king over Israel.’ Then open the door and run. Do not delay!”
Context
1Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị,* werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead. 2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. 3Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.” 4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. 5Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.”
Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?”
Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.