2 Ndị Eze 9:1
2 Kings 9:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị,* werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
2 Kings 9:1 in English
2 Kings 9:1 · Berean Standard Bible
Now Elisha the prophet summoned one of the sons of the prophets and said to him, “Tuck your cloak under your belt,* take this flask of oil, and go to Ramoth-gilead.
Context
1Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị,* werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead. 2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. 3Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.