Native Bible

2 Kings 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.

2 Kings 9:6 in English

2 Kings 9:6 · Berean Standard Bible

So Jehu got up and went into the house, where the young prophet poured the oil on his head and declared, “This is what the LORD, the God of Israel, says: ‘I anoint you king over the LORD’s people Israel.

Context

4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. 5Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.” 6Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel. 7Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru. 8Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.