Native Bible

2 Kings 8:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.”

2 Kings 8:10 in English

2 Kings 8:10 · Berean Standard Bible

Elisha answered, “Go and tell him, ‘You will surely recover.’ But the LORD * has shown me that in fact he will die.”

Context

8Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” 9Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs,* wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” 10Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.” 11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa. 12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.