2 Ndị Eze 8:12
2 Kings 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”
2 Kings 8:12 in English
2 Kings 8:12 · Berean Standard Bible
“Why is my lord weeping?” asked Hazael. “Because I know the evil you will do to the Israelites,” Elisha replied. “You will set fire to their fortresses, kill their young men with the sword, dash their little ones to pieces, and rip open their pregnant women.”
Context
10Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.” 11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa. 12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?”
Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.” 13Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?”
Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.” 14Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.