2 Ndị Eze 8:13
2 Kings 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”
2 Kings 8:13 in English
2 Kings 8:13 · Berean Standard Bible
“But how could your servant, a mere dog, do such a monstrous thing?” said Hazael. And Elisha answered, “The LORD has shown me that you will be king over Aram.”
Context
11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa. 12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?”
Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.” 13Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?”
Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.” 14Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.” 15Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.