2 Ndị Eze 8:9
2 Kings 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs,* wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”
2 Kings 8:9 in English
2 Kings 8:9 · Berean Standard Bible
So Hazael went to meet Elisha, taking with him a gift of forty camel loads of every good thing from Damascus. And he went in and stood before him and said, “Your son Ben-hadad king of Aram has sent me to ask, ‘Will I recover from this illness?’”
Context
7Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.” 8Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” 9Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs,* wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” 10Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.” 11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.