2 Ndị Eze 21:23
2 Kings 21:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya.
2 Kings 21:23 in English
2 Kings 21:23 · Berean Standard Bible
Then the servants of Amon conspired against him and killed the king in his palace.
Context
21Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha.* 22Ọ jụrụ iso Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya. 23Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. 24Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya. 25Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.