2 Ndị Eze 2:24
2 Kings 2:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
2 Kings 2:24 in English
2 Kings 2:24 · Berean Standard Bible
Then he turned around, looked at them, and called down a curse on them in the name of the LORD. Suddenly two female bears came out of the woods and mauled forty-two of the boys.
Context
22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru. 23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!” 24Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha. 25Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.*
2:2 Betel bụ obodo dị mkpa site nʼoge nna nna ochie ndị Izrel. Rehoboam bụ eze wuru ebe ịchụ aja na Betel nʼụzọ ịma aka nye nke e wuru na Jerusalem. Jen 12:8; 22:10-22; 35:1-5; 1Ez 12:28-33
2:14 Akwa ahụ Maọbụ, uwe mwụda Ịlaịja 2Ez 2:8.
2:25 Ọ bụ nʼobodo Sameria ka Ịlaisha biri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.