Native Bible

2 Kings 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”

2 Kings 2:23 in English

2 Kings 2:23 · Berean Standard Bible

From there, Elisha went up to Bethel, and as he was walking up the road, a group of boys * came out of the city and jeered at him, chanting, “Go up, you baldhead! Go up, you baldhead!”

Context

21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ” 22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru. 23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!” 24Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha. 25Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.* 2:2 Betel bụ obodo dị mkpa site nʼoge nna nna ochie ndị Izrel. Rehoboam bụ eze wuru ebe ịchụ aja na Betel nʼụzọ ịma aka nye nke e wuru na Jerusalem. Jen 12:8; 22:10-22; 35:1-5; 1Ez 12:28-33 2:14 Akwa ahụ Maọbụ, uwe mwụda Ịlaịja 2Ez 2:8. 2:25 Ọ bụ nʼobodo Sameria ka Ịlaisha biri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.