2 Ndị Eze 2:22
2 Kings 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
2 Kings 2:22 in English
2 Kings 2:22 · Berean Standard Bible
And the waters there have been healthy to this day, according to the word spoken by Elisha.
Context
20Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya. 21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ” 22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru. 23Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!” 24Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.