Native Bible

2 Kings 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”

2 Kings 2:19 in English

2 Kings 2:19 · Berean Standard Bible

Then the men of the city said to Elisha, “Please note, our lord, that the city’s location is good, as you can see. But the water is bad and the land is unfruitful.”

Context

17Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya. 18Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?” 19Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.” 20Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya. 21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.