2 Ndị Eze 2:17
2 Kings 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya.
2 Kings 2:17 in English
2 Kings 2:17 · Berean Standard Bible
But when they pressed him to the point of embarrassment, he said, “Send them.” And they sent fifty men, who searched for three days but did not find Elijah.
Context
15Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya. 16Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.”
Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.” 17Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya. 18Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?” 19Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.