Native Bible

2 Kings 18:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid.

2 Kings 18:3 in English

2 Kings 18:3 · Berean Standard Bible

And he did what was right in the eyes of the LORD, just as his father David had done.

Context

1Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa eze Izrel ka Hezekaya nwa Ehaz eze Juda malitere ọchịchị nke ya. 2Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija,* ada Zekaraya. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid. 4O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.) 5Hezekaya tụkwasịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel obi ya. Nʼezie, o nwekwaghị onye ọzọ dị ka ya nʼetiti ndị eze Juda niile, ndị bu ya ụzọ chịa, na ndị so ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.