Native Bible

2 Kings 18:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija,* ada Zekaraya.

2 Kings 18:2 in English

2 Kings 18:2 · Berean Standard Bible

He was twenty-five years old when he became king, and he reigned in Jerusalem twenty-nine years. His mother’s name was Abi,* the daughter of Zechariah.

Context

1Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa eze Izrel ka Hezekaya nwa Ehaz eze Juda malitere ọchịchị nke ya. 2Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija,* ada Zekaraya. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid. 4O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.)

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.