2 Ndị Eze 16:12
2 Kings 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya.
2 Kings 16:12 in English
2 Kings 16:12 · Berean Standard Bible
When the king came back from Damascus and saw the altar, he approached it and presented offerings on it.
Context
10Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya. 11Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta. 12Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya. 13Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 14O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.