Native Bible

2 Kings 16:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta.

2 Kings 16:11 in English

2 Kings 16:11 · Berean Standard Bible

And Uriah the priest built the altar according to all the instructions King Ahaz had sent from Damascus, and he completed it by the time King Ahaz had returned.

Context

9Eze ndị Asịrịa ṅara ya ntị site nʼibuso obodo Damaskọs agha na imeri ya. O gburu Rezin, bulaa mmadụ niile bi nʼime ya nʼike ka ha gaa biri nʼobodo Kia. 10Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya. 11Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta. 12Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya. 13Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.