2 Ndị Eze 16:14
2 Kings 16:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya.
2 Kings 16:14 in English
2 Kings 16:14 · Berean Standard Bible
He also took the bronze altar that stood before the LORD from the front of the temple (between the new altar and the house of the LORD) and he put it on the north side of the new altar.
Context
12Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya. 13Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 14O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya. 15Eze Ehaz nyere Ụraya, bụ onyeisi nchụaja iwu, sị, “Ọ bụ nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ a ka ị ga na-esure aja nsure ọkụ ụtụtụ niile, na onyinye mkpụrụ ọka nke uhuruchi niile, na aja nsure ọkụ eze, na onyinye mkpụrụ ọka nke eze, na aja na onyinye nke ndị niile nʼala a, ya na onyinye mkpụrụ ọka ha niile na onyinye ihe ọṅụṅụ ha niile. Fekwasị ọbara niile e ji chụọ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. Ma ebe ịchụ aja ọla ahụ ga-adịrị m iji jụta ase.” 16Ụraya onye nchụaja mere ihe niile dịka eze Ehaz nyere ya nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.