Native Bible

2 Kings 10:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile.

2 Kings 10:28 in English

2 Kings 10:28 · Berean Standard Bible

Thus Jehu eradicated Baal from Israel,

Context

26ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ. 27Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa. 28Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile. 29Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan. 30Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.