2 Ndị Eze 10:27
2 Kings 10:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.
2 Kings 10:27 in English
2 Kings 10:27 · Berean Standard Bible
They also demolished the sacred pillar of Baal. Then they tore down the temple of Baal and made it into a latrine, which it is to this day.
Context
25Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal, 26ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ. 27Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa. 28Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile. 29Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.