Native Bible

2 Kings 10:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal,

2 Kings 10:25 in English

2 Kings 10:25 · Berean Standard Bible

When he had finished making the burnt offering, Jehu said to the guards and officers, “Go in and kill them. Do not let anyone out.” So the guards and officers put them to the sword, threw the bodies out, and went into the inner room of the temple of Baal.

Context

23Mgbe ahụ, Jehu na Jehonadab nwa Rekab, banyere nʼebe nzukọ Baal. Jehu sịrị ndị nʼefe Baal, “Chọzienụ nke ọma ka unu hụ na o nweghị onye ọbụla na-efe Onyenwe anyị nọ nʼebe a, karịakwa naanị ndị na-efe Baal.” 24Mgbe ha malitere ịchụ aja na isure ihe nsure ọkụ, Jehu emeelarị ka iri ndị agha asatọ gbaa ụlọ ahụ niile gburugburu. O nyelarị iwu sị, “Ọ bụrụ na unu ekwere ka otu onye si nʼime ụlọ a gbapụ, unu ga-eji ndụ unu kwụghachi ụgwọ onye dị otu ahụ.” 25Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal, 26ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ. 27Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.