2 Ndị Kọrint 12:4
2 Corinthians 12:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya.
2 Corinthians 12:4 in English
2 Corinthians 12:4 · Berean Standard Bible
was caught up to Paradise. The things he heard were too sacred for words, things that man is not permitted to tell.
Context
2Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. 3Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.