2 Ndị Kọrint 12:5
2 Corinthians 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m.
2 Corinthians 12:5 in English
2 Corinthians 12:5 · Berean Standard Bible
I will boast about such a man, but I will not boast about myself, except in my weaknesses.
Context
3Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.