2 Ndị Kọrint 12:6
2 Corinthians 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m.
2 Corinthians 12:6 in English
2 Corinthians 12:6 · Berean Standard Bible
Even if I wanted to boast, I would not be a fool, because I would be speaking the truth. But I refrain, so no one will credit me with more than he sees in me or hears from me,
Context
4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.