Native Bible

2 Corinthians 12:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu?

2 Corinthians 12:17 in English

2 Corinthians 12:17 · Berean Standard Bible

Did I exploit you by anyone I sent you?

Context

15Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta? 16Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe. 17Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu? 18Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya? 19Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.