Native Bible

2 Corinthians 12:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya?

2 Corinthians 12:18 in English

2 Corinthians 12:18 · Berean Standard Bible

I urged Titus to visit you, and I sent our brother with him. Did Titus exploit you in any way? Did we not walk in the same Spirit and follow in the same footsteps?*

Context

16Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe. 17Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu? 18Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya? 19Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu. 20Nʼihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nʼetiti unu, ihe m ga-ahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emeso unu agakwaghị atọ unu atọ. Nʼihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ, aga m ahụ ọtụtụ nʼime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nʼaghụghọ na ịkpa iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.