2 Ihe E Mere 8:3
2 Chronicles 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
2 Chronicles 8:3 in English
2 Chronicles 8:3 · Berean Standard Bible
Then Solomon went to Hamath-zobah and captured it.
Context
1Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze nke ya onwe ya, 2Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram* nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha. 3Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha. 4O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat. 5O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.