Native Bible

2 Chronicles 32:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.

2 Chronicles 32:20 in English

2 Chronicles 32:20 · Berean Standard Bible

In response, King Hezekiah and the prophet Isaiah son of Amoz cried out to heaven in prayer,

Context

18Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ. 19Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ. 20Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere. 21Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ. 22Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.