Native Bible

2 Chronicles 32:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.

2 Chronicles 32:19 in English

2 Chronicles 32:19 · Berean Standard Bible

They spoke against the God of Jerusalem as they had spoken against the gods of the peoples of the earth—the work of human hands.

Context

17Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.” 18Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ. 19Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ. 20Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere. 21Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.