2 Ihe E Mere 32:22
2 Chronicles 32:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.
2 Chronicles 32:22 in English
2 Chronicles 32:22 · Berean Standard Bible
So the LORD saved Hezekiah and the people of Jerusalem from the hands of King Sennacherib of Assyria and all the others, and He gave them rest on every side.
Context
20Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere. 21Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ. 22Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile. 23Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya. 24Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.