2 Ihe E Mere 29:20
2 Chronicles 29:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.
2 Chronicles 29:20 in English
2 Chronicles 29:20 · Berean Standard Bible
Early the next morning King Hezekiah gathered the city officials and went up to the house of the LORD.
Context
18Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya. 19Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.” 20Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. 21Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. 22Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.