Native Bible

2 Chronicles 29:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.

2 Chronicles 29:21 in English

2 Chronicles 29:21 · Berean Standard Bible

They brought seven bulls, seven rams, seven lambs, and seven male goats as a sin offering for the kingdom, for the sanctuary, and for Judah. And the king commanded the priests, the descendants of Aaron, to offer them on the altar of the LORD.

Context

19Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.” 20Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. 21Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. 22Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja. 23Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.